1 Ihe E Mere 23:28
1 Chronicles 23:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọrụ e nyere ndị Livayị niile bụ inyere ụmụ Erọn ndị nchụaja aka nʼofufe nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị: ilekọta ogige, na ọnụụlọ nta ndị dị nʼakụkụ ya niile, na ime ka ihe nsọ niile dị ọcha, na ịrụ ọrụ ọbụla e nyere ha nʼụlọ Chineke.
1 Chronicles 23:28 in English
1 Chronicles 23:28 · Berean Standard Bible
but their duty was to assist the descendants of Aaron with the service of the house of the LORD, being responsible for the courts and chambers, the purification of all the holy things, and the work of the service of the house of God,
Context
26Ugbu a, ọ dịkwaghị mkpa ọ dị na ndị Livayị ga na-ebugharị ụlọ ikwu, maọbụ ngwongwo ọbụla nke ije ozi niile ya.” 27Ịgụ ndị Livayị ọnụ bụ otu nʼime ihe ikpeazụ Devid mere tupu ọ nwụọ. A gụrụ ndị Livayị gbara iri afọ abụọ gbagoo ọnụ. 28Ọrụ e nyere ndị Livayị niile bụ inyere ụmụ Erọn ndị nchụaja aka nʼofufe nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị: ilekọta ogige, na ọnụụlọ nta ndị dị nʼakụkụ ya niile, na ime ka ihe nsọ niile dị ọcha, na ịrụ ọrụ ọbụla e nyere ha nʼụlọ Chineke. 29Ọ bụkwa ọrụ ha iwebata achịcha a na-eche nʼihu Chineke, na ụtụ ọka e ji enye onyinye mkpụrụ ọka, na achịcha mbadamba a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. Ọrụ ha bụkwa ịgwakọta ihe e ji eme achịcha, na ighe ya, na ilekọta ihe ọtụtụ niile e ji atụ ihe. 30Ụtụtụ ọbụla, na anyasị ọbụla, ọ bụ ọrụ ha iguzo nʼihu Onyenwe anyị ịbụ abụ otuto, na ekele.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.