Native Bible

1 Chronicles 23:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a, ọ dịkwaghị mkpa ọ dị na ndị Livayị ga na-ebugharị ụlọ ikwu, maọbụ ngwongwo ọbụla nke ije ozi niile ya.”

1 Chronicles 23:26 in English

1 Chronicles 23:26 · Berean Standard Bible

So now the Levites no longer need to carry the tabernacle or any of the articles for its service.”

Context

24Ndị a bụ ụmụ ụmụ Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị, ndịisi ezi, dịka e si debanye aha, na dịka e si gụọ ha ọnụ nʼotu nʼotu, ya bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị gbara iri afọ abụọ gbagoo. 25Nʼihi na Devid kwuru sị, “Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị, Chineke Izrel enyela ndị ya udo, ebe ọ bụkwa na ọ ga-ebi na Jerusalem ruo ebighị ebi. 26Ugbu a, ọ dịkwaghị mkpa ọ dị na ndị Livayị ga na-ebugharị ụlọ ikwu, maọbụ ngwongwo ọbụla nke ije ozi niile ya.” 27Ịgụ ndị Livayị ọnụ bụ otu nʼime ihe ikpeazụ Devid mere tupu ọ nwụọ. A gụrụ ndị Livayị gbara iri afọ abụọ gbagoo ọnụ. 28Ọrụ e nyere ndị Livayị niile bụ inyere ụmụ Erọn ndị nchụaja aka nʼofufe nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị: ilekọta ogige, na ọnụụlọ nta ndị dị nʼakụkụ ya niile, na ime ka ihe nsọ niile dị ọcha, na ịrụ ọrụ ọbụla e nyere ha nʼụlọ Chineke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.