1 Ihe E Mere 23:29
1 Chronicles 23:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụkwa ọrụ ha iwebata achịcha a na-eche nʼihu Chineke, na ụtụ ọka e ji enye onyinye mkpụrụ ọka, na achịcha mbadamba a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. Ọrụ ha bụkwa ịgwakọta ihe e ji eme achịcha, na ighe ya, na ilekọta ihe ọtụtụ niile e ji atụ ihe.
1 Chronicles 23:29 in English
1 Chronicles 23:29 · Berean Standard Bible
as well as for the rows of the showbread, the fine flour for the grain offering, the wafers of unleavened bread, the baking, the mixing, and all measurements of quantity and size.
Context
27Ịgụ ndị Livayị ọnụ bụ otu nʼime ihe ikpeazụ Devid mere tupu ọ nwụọ. A gụrụ ndị Livayị gbara iri afọ abụọ gbagoo ọnụ. 28Ọrụ e nyere ndị Livayị niile bụ inyere ụmụ Erọn ndị nchụaja aka nʼofufe nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị: ilekọta ogige, na ọnụụlọ nta ndị dị nʼakụkụ ya niile, na ime ka ihe nsọ niile dị ọcha, na ịrụ ọrụ ọbụla e nyere ha nʼụlọ Chineke. 29Ọ bụkwa ọrụ ha iwebata achịcha a na-eche nʼihu Chineke, na ụtụ ọka e ji enye onyinye mkpụrụ ọka, na achịcha mbadamba a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. Ọrụ ha bụkwa ịgwakọta ihe e ji eme achịcha, na ighe ya, na ilekọta ihe ọtụtụ niile e ji atụ ihe. 30Ụtụtụ ọbụla, na anyasị ọbụla, ọ bụ ọrụ ha iguzo nʼihu Onyenwe anyị ịbụ abụ otuto, na ekele. 31Ha na-enyekwa aka nʼihe gbasara aja nsure ọkụ a na-achụ nʼụbọchị izuike, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka. Mgbe niile ka ha ga-eje ozi ha nʼihu Onyenwe anyị dịka usoro ha na ọnụọgụgụ ha si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.