Native Bible

1 Chronicles 21:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere Gad iwu ka ọ gwa Devid, ka ọ gaa wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus.

1 Chronicles 21:18 in English

1 Chronicles 21:18 · Berean Standard Bible

Then the angel of the LORD ordered Gad to tell David to go up and build an altar to the LORD on the threshing floor of Ornan the Jebusite.

Context

16Mgbe Devid leliri anya elu hụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzo nʼetiti mbara eluigwe na ụwa, hụkwa mma agha o ji, nke o chere ihu ya na Jerusalem, ya na ndị okenye Izrel yi akwa mkpe, dara nʼala kpuo ihu nʼala. 17Devid sịrị Chineke, “Ọ bụghị m nyere iwu ka a gụọ ndị tozuru ibu agha ọnụ? Ọ bụ mụ onwe m, mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mehiere mee ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? Onyenwe anyị Chineke m, biko ekwela ka ọrịa a na-efe efe nọgide nʼahụ ndị gị, ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.” 18Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere Gad iwu ka ọ gwa Devid, ka ọ gaa wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus. 19Ya mere, Devid rubere isi gaa dịka okwu ahụ Gad kwuru nʼaha Onyenwe anyị. 20Mgbe Arauna nọ nʼebe ịzọcha ọka, ọ tụgharịrị hụ mmụọ ozi ahụ, ụmụ ya ndị ikom anọ ndị so ya guzo nʼebe ahụ zoro onwe ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.