Native Bible

1 Chronicles 19:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Abishai na-apụ, Joab gwara ya okwu sị ya, “Ọ bụrụ na ndị Aram esie ike karịa m, mgbe ahụ, ị ga-abịa napụta m. Ọ bụrụkwanụ na ndị Amọn adịrị ike karịa gị, aga m abịa napụta gị.

1 Chronicles 19:12 in English

1 Chronicles 19:12 · Berean Standard Bible

“If the Arameans are too strong for me,” said Joab, “then you will come to my rescue. And if the Ammonites are too strong for you, then I will come to your rescue.

Context

10Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram. 11O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, e zipụrụ ha izute ndị Amọn nʼagha. 12Mgbe Abishai na-apụ, Joab gwara ya okwu sị ya, “Ọ bụrụ na ndị Aram esie ike karịa m, mgbe ahụ, ị ga-abịa napụta m. Ọ bụrụkwanụ na ndị Amọn adịrị ike karịa gị, aga m abịa napụta gị. 13Nwee obi ike, ka anyị lụọ ọgụ a dịka ndị dị ike, nʼihi ndị anyị na obodo niile nke Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị meekwa ihe dị mma nʼanya ya.” 14Mgbe ahụ, Joab na ndị agha so ya bịara nso ibuso ndị Aram agha, ha sitere nʼihu ha gbapụ ọsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.