Native Bible

1 Chronicles 19:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram.

1 Chronicles 19:10 in English

1 Chronicles 19:10 · Berean Standard Bible

When Joab saw the battle lines before him and behind him, he selected some of the best men of Israel and arrayed them against the Arameans.

Context

8Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha. 9Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha. Ma ndị eze ahụ bịara agha, nọpụrụ onwe ha na mbara ala. 10Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram. 11O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, e zipụrụ ha izute ndị Amọn nʼagha. 12Mgbe Abishai na-apụ, Joab gwara ya okwu sị ya, “Ọ bụrụ na ndị Aram esie ike karịa m, mgbe ahụ, ị ga-abịa napụta m. Ọ bụrụkwanụ na ndị Amọn adịrị ike karịa gị, aga m abịa napụta gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.