Native Bible

1 Chronicles 19:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha. Ma ndị eze ahụ bịara agha, nọpụrụ onwe ha na mbara ala.

1 Chronicles 19:9 in English

1 Chronicles 19:9 · Berean Standard Bible

The Ammonites marched out and arrayed themselves for battle at the entrance to the city, while the kings who had come stayed by themselves in the open country.

Context

7Ha goro ụgbọ agha ọnụọgụgụ ya dị iri puku atọ, na puku abụọ. Ha gokwara eze Maaka na ndị agha ya, ndị bịara maa ụlọ ikwu agha ha na nso Medeba, ebe ndị Amọn sikwa nʼobodo ha niile chịkọta onwe ha pụta ịlụ agha. 8Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha. 9Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha. Ma ndị eze ahụ bịara agha, nọpụrụ onwe ha na mbara ala. 10Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram. 11O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, e zipụrụ ha izute ndị Amọn nʼagha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.