Native Bible

1 Chronicles 18:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid merikwara ndị Moab, ha ghọrọ ndị ohu ya, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.

1 Chronicles 18:2 in English

1 Chronicles 18:2 · Berean Standard Bible

David also defeated the Moabites, and they became subject to David and brought him tribute.

Context

1Mgbe nke a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia, mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Gat na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu site nʼaka ndị Filistia. 2Devid merikwara ndị Moab, ha ghọrọ ndị ohu ya, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla. 3Devid merikwara Hadadeza eze Zoba, na nso Hamat, mgbe ọ na-aga iguzobe ogidi eji mara ya nʼakụkụ osimiri Yufretis. 4Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.