Native Bible

1 Chronicles 18:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid merikwara Hadadeza eze Zoba, na nso Hamat, mgbe ọ na-aga iguzobe ogidi eji mara ya nʼakụkụ osimiri Yufretis.

1 Chronicles 18:3 in English

1 Chronicles 18:3 · Berean Standard Bible

As far as Hamath, David also defeated King Hadadezer of Zobah, who had marched out to establish his dominion * along the Euphrates River.

Context

1Mgbe nke a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia, mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Gat na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu site nʼaka ndị Filistia. 2Devid merikwara ndị Moab, ha ghọrọ ndị ohu ya, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla. 3Devid merikwara Hadadeza eze Zoba, na nso Hamat, mgbe ọ na-aga iguzobe ogidi eji mara ya nʼakụkụ osimiri Yufretis. 4Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya. 5Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.