1 Ihe E Mere 13:4
1 Chronicles 13:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha niile kwekọrịtara ime nke a nʼihi na okwu ahụ dị ndị niile zukọrọ mma.
1 Chronicles 13:4 in English
1 Chronicles 13:4 · Berean Standard Bible
And because this proposal seemed right to all the people, the whole assembly agreed to it.
Context
2Ọ gwara ọgbakọ Izrel niile ahụ sị, “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, ọ bụrụkwa na ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị Chineke anyị, ka anyị ziga ozi zie ụmụnna anyị niile bi nʼakụkụ niile nke ala Izrel, na ndị nchụaja na ndị Livayị niile, bi nʼobodo ha na ndị bi nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, ka ha bịa, soro anyị. 3Ka anyị gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼihi na e lefuru ya anya nʼoge ahụ niile Sọl bụ eze.” 4Ha niile kwekọrịtara ime nke a nʼihi na okwu ahụ dị ndị niile zukọrọ mma. 5Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ndị Izrel niile oku ka ha zuo ezuo site nʼebe niile ha bi, site nʼoke ala ha na ndị Ijipt, ya bụ iyi Shiho, ruo nʼoke ala dị nʼugwu, ya bụ Lebo Hamat, ka ha gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke site na Kiriat Jearim. 6Devid na ndị Izrel niile jere Baala nʼime Juda, ya bụ Kiriat Jearim, i si nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, bụ Onyenwe anyị, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim, igbe ahụ nke akpọkwasịrị aha ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.