1 Ihe E Mere 13:5
1 Chronicles 13:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ndị Izrel niile oku ka ha zuo ezuo site nʼebe niile ha bi, site nʼoke ala ha na ndị Ijipt, ya bụ iyi Shiho, ruo nʼoke ala dị nʼugwu, ya bụ Lebo Hamat, ka ha gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke site na Kiriat Jearim.
1 Chronicles 13:5 in English
1 Chronicles 13:5 · Berean Standard Bible
So David assembled all Israel, from the River Shihor * in Egypt to Lebo-hamath, to bring the ark of God from Kiriath-jearim.
Context
3Ka anyị gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼihi na e lefuru ya anya nʼoge ahụ niile Sọl bụ eze.” 4Ha niile kwekọrịtara ime nke a nʼihi na okwu ahụ dị ndị niile zukọrọ mma. 5Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ndị Izrel niile oku ka ha zuo ezuo site nʼebe niile ha bi, site nʼoke ala ha na ndị Ijipt, ya bụ iyi Shiho, ruo nʼoke ala dị nʼugwu, ya bụ Lebo Hamat, ka ha gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke site na Kiriat Jearim. 6Devid na ndị Izrel niile jere Baala nʼime Juda, ya bụ Kiriat Jearim, i si nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, bụ Onyenwe anyị, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim, igbe ahụ nke akpọkwasịrị aha ya. 7Ha ji ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ buru igbe ọgbụgba ndụ Chineke site nʼụlọ Abinadab, Ụza na Ahio na-eduzi ụgbọala ahụ ụzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.