Native Bible

1 Chronicles 13:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gwara ọgbakọ Izrel niile ahụ sị, “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, ọ bụrụkwa na ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị Chineke anyị, ka anyị ziga ozi zie ụmụnna anyị niile bi nʼakụkụ niile nke ala Izrel, na ndị nchụaja na ndị Livayị niile, bi nʼobodo ha na ndị bi nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, ka ha bịa, soro anyị.

1 Chronicles 13:2 in English

1 Chronicles 13:2 · Berean Standard Bible

And he said to the whole assembly of Israel, “If it seems good to you, and if this is of the LORD our God, let us send word far and wide to the rest of our brothers in all the land of Israel, and also to the priests and Levites in their cities and pasturelands, so that they may join us.

Context

1Devid na ndịisi agha ya na-achị imerime puku ndị agha, na ọtụtụ narị ndị agha, zukọrọ gbaa izu. 2Ọ gwara ọgbakọ Izrel niile ahụ sị, “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, ọ bụrụkwa na ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị Chineke anyị, ka anyị ziga ozi zie ụmụnna anyị niile bi nʼakụkụ niile nke ala Izrel, na ndị nchụaja na ndị Livayị niile, bi nʼobodo ha na ndị bi nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, ka ha bịa, soro anyị. 3Ka anyị gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼihi na e lefuru ya anya nʼoge ahụ niile Sọl bụ eze.” 4Ha niile kwekọrịtara ime nke a nʼihi na okwu ahụ dị ndị niile zukọrọ mma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.