1 Ihe E Mere 13:10
1 Chronicles 13:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, o tigburu ya nʼihi na o metụrụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ aka. Ya mere, ọ nwụrụ nʼebe ahụ nʼihu Chineke.
1 Chronicles 13:10 in English
1 Chronicles 13:10 · Berean Standard Bible
And the anger of the LORD burned against Uzzah, and He struck him down because he had put his hand on the ark. So he died there before God.
Context
8Devid na ndị Izrel niile weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Chineke, jiri abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na iti egwu na-etekwa egwu. 9Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Kidon, Ụza setịpụrụ aka ya ijide igbe ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ. 10Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, o tigburu ya nʼihi na o metụrụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ aka. Ya mere, ọ nwụrụ nʼebe ahụ nʼihu Chineke. 11Mgbe ahụ, iwe were Devid nʼihi ọnụma Onyenwe anyị dakwasịrị Ụza, ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza. 12Devid tụrụ egwu Chineke nʼụbọchị ahụ, o kwuru sị, “M ga-esi aṅaa bubatara onwe m igbe ọgbụgba ndụ a?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.