Native Bible

1 Chronicles 13:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Kidon, Ụza setịpụrụ aka ya ijide igbe ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ.

1 Chronicles 13:9 in English

1 Chronicles 13:9 · Berean Standard Bible

When they came to the threshing floor of Chidon,* Uzzah reached out and took hold of the ark, because the oxen had stumbled.

Context

7Ha ji ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ buru igbe ọgbụgba ndụ Chineke site nʼụlọ Abinadab, Ụza na Ahio na-eduzi ụgbọala ahụ ụzọ. 8Devid na ndị Izrel niile weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Chineke, jiri abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na iti egwu na-etekwa egwu. 9Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Kidon, Ụza setịpụrụ aka ya ijide igbe ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ. 10Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, o tigburu ya nʼihi na o metụrụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ aka. Ya mere, ọ nwụrụ nʼebe ahụ nʼihu Chineke. 11Mgbe ahụ, iwe were Devid nʼihi ọnụma Onyenwe anyị dakwasịrị Ụza, ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.