Native Bible

Zechariah 8:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka unu bụ Juda na Izrel si bụrụ ihe a na-abụ ọnụ nʼetiti mba dị iche iche, otu a ka m ga-esi zọpụta unu, unu ga-abụkwa ngọzị. Unu atụla ụjọ, kama meenụ ka aka unu sie ike nʼọrụ unu.”

Zechariah 8:13 in English

Zechariah 8:13 · Berean Standard Bible

As you have been a curse among the nations, O house of Judah and house of Israel, so I will save you, and you will be a blessing. Do not be afraid; let your hands be strong.”

Context

11Ma ugbu a, agaghị m emeso ndị fọdụrụ nʼala a, dịka m si meso ha nʼoge gara aga.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. 12“Nʼihi na mkpụrụ ga-eto nke ọma, osisi vaịnị ga-amị mkpụrụ ya, ala ubi ga-ewepụtakwa ihe omume, igirigi eluigwe ga-ezokwasịkwa ala. Ihe ndị a niile ka m ga-enye ndị fọdụrụ nʼala a ka ọ bụụrụ ha ihe nketa. 13Dịka unu bụ Juda na Izrel si bụrụ ihe a na-abụ ọnụ nʼetiti mba dị iche iche, otu a ka m ga-esi zọpụta unu, unu ga-abụkwa ngọzị. Unu atụla ụjọ, kama meenụ ka aka unu sie ike nʼọrụ unu.” 14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Dịka m si kpebie ime ka ihe ọjọọ bịakwasị unu, na dịka m na-egosighị ebere nʼahụ nna nna unu ha mgbe ha kpasuru m iwe,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, 15“otu a ka m kpebikwara ọzọ nʼụbọchị ndị a imere Jerusalem na Juda ihe ọma. Unu atụla ụjọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.