Zekaraya 8:12
Zechariah 8:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi na mkpụrụ ga-eto nke ọma, osisi vaịnị ga-amị mkpụrụ ya, ala ubi ga-ewepụtakwa ihe omume, igirigi eluigwe ga-ezokwasịkwa ala. Ihe ndị a niile ka m ga-enye ndị fọdụrụ nʼala a ka ọ bụụrụ ha ihe nketa.
Zechariah 8:12 in English
Zechariah 8:12 · Berean Standard Bible
“For the seed will be prosperous, the vine will yield its fruit, the ground will yield its produce, and the skies will give their dew. To the remnant of this people I will give all these things as an inheritance.
Context
10Tupu ụbọchị ahụ, akwụbeghị ma ndị mmadụ ma ụmụ anụmanụ ụgwọ ọrụ ha. Ọ dịghịkwa udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼihi ndị iro ya, ebe m mere ka onye ọbụla bụrụ onye na-emegide ibe ya. 11Ma ugbu a, agaghị m emeso ndị fọdụrụ nʼala a, dịka m si meso ha nʼoge gara aga.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. 12“Nʼihi na mkpụrụ ga-eto nke ọma, osisi vaịnị ga-amị mkpụrụ ya, ala ubi ga-ewepụtakwa ihe omume, igirigi eluigwe ga-ezokwasịkwa ala. Ihe ndị a niile ka m ga-enye ndị fọdụrụ nʼala a ka ọ bụụrụ ha ihe nketa. 13Dịka unu bụ Juda na Izrel si bụrụ ihe a na-abụ ọnụ nʼetiti mba dị iche iche, otu a ka m ga-esi zọpụta unu, unu ga-abụkwa ngọzị. Unu atụla ụjọ, kama meenụ ka aka unu sie ike nʼọrụ unu.” 14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Dịka m si kpebie ime ka ihe ọjọọ bịakwasị unu, na dịka m na-egosighị ebere nʼahụ nna nna unu ha mgbe ha kpasuru m iwe,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.