Zekaraya 6:7
Zechariah 6:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ịnyịnya ndị ahụ dị ike pụtara, chọọ ka e nye ha ike ijegharị nʼụwa niile, ọ gwara ha sị, “Gaanụ jegharịa nʼụwa niile.” Nʼihi ya, ha pụrụ jegharịa nʼụwa niile.
Zechariah 6:7 in English
Zechariah 6:7 · Berean Standard Bible
As the strong horses went out, they were eager to go and patrol the earth; and the LORD said, “Go and patrol the earth.” So they patrolled the earth.
Context
5Mmụọ ozi ahụ zara m, sị, “Ndị a bụ mmụọ anọ* nke eluigwe, ka ha na-apụ mgbe ha guzochara nʼihu Onyenwe elu ụwa niile. 6Ụgbọala nke ịnyịnya ndị dị oji na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ugwu. Nke ịnyịnya ndị dị ọcha na-adọkpụ na-aga nʼọdịda anyanwụ. Nke ahụ ndị ịnyịnya na-adịghị ezi ọcha na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ndịda.” 7Mgbe ịnyịnya ndị ahụ dị ike pụtara, chọọ ka e nye ha ike ijegharị nʼụwa niile, ọ gwara ha sị, “Gaanụ jegharịa nʼụwa niile.” Nʼihi ya, ha pụrụ jegharịa nʼụwa niile. 8Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Ndị ahụ jere nʼakụkụ ugwu emeela ka Mmụọ m dajụọ nʼala dị nʼakụkụ ugwu.” 9Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.