Zekaraya 6:2
Zechariah 6:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụgbọ ịnyịnya nke mbụ ka ịnyịnya na-acha ọbara ọbara na-adọkpụ. Nke abụọ ka ịnyịnya na-eji nji na-adọkpụ.
Zechariah 6:2 in English
Zechariah 6:2 · Berean Standard Bible
The first chariot had red horses, the second black horses,
Context
1Elelikwara m anya elu ọzọ hụ ụgbọ ịnyịnya anọ nke si nʼetiti ugwu abụọ na-apụta. Ugwu ndị a bụ ugwu e ji bronz mee. 2Ụgbọ ịnyịnya nke mbụ ka ịnyịnya na-acha ọbara ọbara na-adọkpụ. Nke abụọ ka ịnyịnya na-eji nji na-adọkpụ. 3Nke atọ ka ịnyịnya dị ọcha na-adọkpụ, ma nke anọ ka ịnyịnya tụrụ agwa siekwa ike na-adọkpụ. 4Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Gịnị ka ihe ndị a bụ, nna m ukwu?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.