Native Bible

Zechariah 4:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu lọghachiri kpọtee m, dịka e si akpọte onye nọ nʼụra.

Zechariah 4:1 in English

Zechariah 4:1 · Berean Standard Bible

Then the angel who was speaking with me returned and woke me, as a man is awakened from his sleep.

Context

1Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu lọghachiri kpọtee m, dịka e si akpọte onye nọ nʼụra. 2Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ana m ahụ ihe ịdọba oriọna e ji ọlaedo mee. O nwere ọkwa nʼisi ya, nweekwa oriọna asaa, nke na-enwu nʼelu ya. Oriọna asaa ndị a nwekwara okporo asaa e si agbanye mmanụ nʼime ha. 3Ahụkwara m osisi oliv abụọ nke dị nʼakụkụ ihe ịdọba oriọna ahụ. Otu dị nʼotu akụkụ ya, nke ọzọ, nʼakụkụ nke ọzọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.