Zekaraya 3:8
Zechariah 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Gee m ntị, gị Joshua, onyeisi nchụaja na unu ndị nchụaja ndị ọzọ nọ nʼihu gị, ndị bụ ihe ngosi banyere ihe ọma niile nke gaje ịbịa. Agaje m ịkpọta nwaodibo m, onye bụ Ngalaba ahụ.
Zechariah 3:8 in English
Zechariah 3:8 · Berean Standard Bible
Hear now, O high priest Joshua, you and your companions seated before you, who are indeed a sign. For behold, I am going to bring My servant, the Branch.
Context
6Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nyere Joshua ndụmọdụ sị, 7“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ bụrụ na i jee ije nʼụzọ m niile, ọ bụrụkwa na i debe ihe niile m nyere gị nʼiwu, ị ga-abụ onyeisi ezinaụlọ m, ị ga-elekọta ụlọnsọ m anya, aga m enyekwa gị ọnọdụ nʼetiti ndị a niile guzo nʼebe a. 8“ ‘Gee m ntị, gị Joshua, onyeisi nchụaja na unu ndị nchụaja ndị ọzọ nọ nʼihu gị, ndị bụ ihe ngosi banyere ihe ọma niile nke gaje ịbịa. Agaje m ịkpọta nwaodibo m, onye bụ Ngalaba ahụ. 9Lee, nkume nke m guzobere nʼihu Joshua. Nkume ahụ nwere akụkụ* asaa nʼahụ ya, aga m egbunye akara dee ihe nʼelu ya. Aga m ewezugakwa mmehie nke ala a nʼotu ụbọchị.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 10“ ‘Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-akpọbata mmadụ ibe ya, ka ọ bịa soro ya nọdụ nʼokpuru osisi vaịnị ya, na nʼokpuru osisi fiig ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”
3:9 Maọbụ, ihu asaa
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.