Native Bible

Zechariah 3:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nyere Joshua ndụmọdụ sị,

Zechariah 3:6 in English

Zechariah 3:6 · Berean Standard Bible

Then the angel of the LORD gave this charge to Joshua:

Context

4Mmụọ ozi ahụ gwara ndị ahụ guzo ya nʼihu, “Yipụnụ ya uwe a ruru unyi.” Mgbe ahụ, ọ gwara ya okwu sị, “Lee, ewepụla m mmehie gị, ma ugbu a, aga m eyikwasị gị uwe mmemme ndị a.” 5Ekwuru m, “Ka ha were ezi akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi.” Ya mere ha weere akwa okike dị ọcha kee ya nʼisi, yikwasịkwa ya uwe ọhụrụ. Mmụọ ozi Onyenwe anyị guzokwa nʼebe ahụ. 6Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nyere Joshua ndụmọdụ sị, 7“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ bụrụ na i jee ije nʼụzọ m niile, ọ bụrụkwa na i debe ihe niile m nyere gị nʼiwu, ị ga-abụ onyeisi ezinaụlọ m, ị ga-elekọta ụlọnsọ m anya, aga m enyekwa gị ọnọdụ nʼetiti ndị a niile guzo nʼebe a. 8“ ‘Gee m ntị, gị Joshua, onyeisi nchụaja na unu ndị nchụaja ndị ọzọ nọ nʼihu gị, ndị bụ ihe ngosi banyere ihe ọma niile nke gaje ịbịa. Agaje m ịkpọta nwaodibo m, onye bụ Ngalaba ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.