Zekaraya 2:12
Zechariah 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ga-eketa Juda dịka oke ya nʼime ala ahụ dị nsọ. Ọ ga-ahọrọkwa Jerusalem ọzọ.
Zechariah 2:12 in English
Zechariah 2:12 · Berean Standard Bible
And the LORD will take possession of Judah as His portion in the Holy Land, and He will once again choose Jerusalem.
Context
10“Tie mkpu ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị Ada Zayọn. Nʼihi na ana m abịa ibi nʼetiti gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 11“Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ mba dị iche iche ga-adịnyere Onyenwe anyị, bụrụkwa ndị nke m. Aga m ebi nʼetiti gị, ị ga-amatakwa na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ka m bịakwute gị. 12Onyenwe anyị ga-eketa Juda dịka oke ya nʼime ala ahụ dị nsọ. Ọ ga-ahọrọkwa Jerusalem ọzọ. 13Derenụ duu nʼihu Onyenwe anyị, unu mmadụ niile, nʼihi na o sitela nʼebe obibi ya dị nsọ kpalie onwe ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.