Zekaraya 2:10
Zechariah 2:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Tie mkpu ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị Ada Zayọn. Nʼihi na ana m abịa ibi nʼetiti gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Zechariah 2:10 in English
Zechariah 2:10 · Berean Standard Bible
“Shout for joy and be glad, O Daughter of Zion, for I am coming to dwell among you,” declares the LORD.
Context
8Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Mgbe Onye ahụ dị ebube zipụrụ m ịga megide mba ndị ahụ niile kwakọọrọ ihe unu. Nʼihi na onye ọbụla metụrụ unu aka bụ mkpụrụ anya m ka ọ na-emetụ aka. 9Aghaghị m iweli aka m imegide ha, meekwa ka ndị ohu ha kwakọrọ ihe niile ha nwere. Mgbe ahụ, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m. 10“Tie mkpu ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị Ada Zayọn. Nʼihi na ana m abịa ibi nʼetiti gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 11“Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ mba dị iche iche ga-adịnyere Onyenwe anyị, bụrụkwa ndị nke m. Aga m ebi nʼetiti gị, ị ga-amatakwa na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ka m bịakwute gị. 12Onyenwe anyị ga-eketa Juda dịka oke ya nʼime ala ahụ dị nsọ. Ọ ga-ahọrọkwa Jerusalem ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.