Native Bible

Zechariah 14:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-ede nʼahụ ataṅụ nke ịnyịnya niile na-anya nʼolu ha bụ nke a: “Ihe dị Nsọ nye Onyenwe anyị.” Ite niile e ji esi nri dị nʼụlọ nke Onyenwe anyị ga-adị ka efere nsọ ndị ahụ dị nʼihu ebe ịchụ aja.

Zechariah 14:20 in English

Zechariah 14:20 · Berean Standard Bible

On that day, HOLY TO THE LORD * will be inscribed on the bells of the horses, and the cooking pots in the house of the LORD will be like the sprinkling bowls before the altar.

Context

18Ọ bụrụ na ndị Ijipt ajụ ịga soro ndị ọzọ ife ofufe ahụ, ha agaghị enweta mmiri ozuzo. Onyenwe anyị ga-eme ka ọrịa ọjọọ ahụ bịakwasị ha, dịka ọ siri bịakwasị mba ndị ahụ niile jụrụ iso mee mmemme ụlọ Ikwu. 19Nke a ga-abụ ahụhụ dịrị ndị Ijipt, na ndị mba dị iche iche, ndị na-agaghị eso na mmemme ụlọ Ikwu ahụ. 20Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-ede nʼahụ ataṅụ nke ịnyịnya niile na-anya nʼolu ha bụ nke a: “Ihe dị Nsọ nye Onyenwe anyị.” Ite niile e ji esi nri dị nʼụlọ nke Onyenwe anyị ga-adị ka efere nsọ ndị ahụ dị nʼihu ebe ịchụ aja. 21Ite niile dị na Juda, na nʼime Jerusalem ga-adị nsọ nye Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ndị niile bịara ịchụ aja ga-ewere ụfọdụ nʼime ite ndị a sie nri ịchụ aja ha. Nʼụbọchị ahụ kwa, a gaghị ahụ kwa ndị na-atụ mgbereahịa* nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 14:21 Maọbụ, Onye Kenan

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.