Zekaraya 14:11
Zechariah 14:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-ebiju na ya na-enweghị nsogbu. A gaghị emebikwa ya ọzọ. Jerusalem ga-ebikwa nʼudo na-atụghị egwu.
Zechariah 14:11 in English
Zechariah 14:11 · Berean Standard Bible
People will live there, and never again will there be an utter destruction. So Jerusalem will dwell securely.
Context
9Ma Onyenwe anyị ga-abụ eze nʼelu ụwa niile. Nʼụbọchị ahụ, naanị otu Onyenwe anyị ga-adị, naanị aha ya kwa ka a ga na-efe ofufe. 10Ala niile, site na Geba ruo Rimọn, nke dị na ndịda Jerusalem ga-adị ka ọzara. Ma ọ bụ naanị Jerusalem ga-adị nʼebe lara elu. Ọ ga-adịkwa nʼọnọdụ ya site nʼọnụ ụzọ ama nke Benjamin ruo nʼebe ọnụ ụzọ ama nke Mbụ, ruo nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼAkụkụ, sitekwa nʼỤlọ elu Hananel ruo nʼebe a na-azọchapụta mmanya eze. 11A ga-ebiju na ya na-enweghị nsogbu. A gaghị emebikwa ya ọzọ. Jerusalem ga-ebikwa nʼudo na-atụghị egwu. 12Nke a bụ ọrịa ọjọọ nke Onyenwe anyị ga-eji kụda mba niile buru agha megide Jerusalem. Anụ ahụ ha ga-ere ure mgbe ha ka guzo ọtọ. Anya ha ga-erekwa ure, ire ha ga-erekwa ure nʼọnụ ha. 13Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-etinye ndị mmadụ oke ụjọ nʼobi. Oke ọgbaaghara ga-adị nʼetiti ha, ha ga-alụsokwa ibe ha ọgụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.