Zekaraya 10:7
Zechariah 10:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Ifrem ga-aghọ ndị dị ike nʼagha, ha ga-enwe ọṅụ dịka ndị na-aṅụ mmanya. Ụmụ ha ga-ahụ ya ṅụrịakwa ọṅụ, ha ga-ejikwa obi ha niile ṅụrịa ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
Zechariah 10:7 in English
Zechariah 10:7 · Berean Standard Bible
Ephraim will be like a mighty man, and their hearts will be glad as with wine. Their children will see it and be joyful; their hearts will rejoice in the LORD.
Context
5Ha niile ga-ejikọta onwe ha ọnụ, dịka ndị bụ dike nʼagha,
ha ga-azọda ndị iro ha nʼapịtị nke okporoụzọ niile.
Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere ha,
ha ga-alụgbukwa ndị iro niile na-agba ịnyịnya. 6“Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike,
zọpụtakwa ụlọ Josef.
Aga m eme ka ha lọghachita,
nʼihi na aga m egosi ha obi ebere.
Ha ga-adị
ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla,
nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha,
aga m azakwa arịrịọ ha. 7Ndị Ifrem ga-aghọ ndị dị ike nʼagha,
ha ga-enwe ọṅụ dịka ndị na-aṅụ mmanya.
Ụmụ ha ga-ahụ ya ṅụrịakwa ọṅụ,
ha ga-ejikwa obi ha niile ṅụrịa ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. 8Mgbe ahụ, aga m akpọ ha oku,
chịkọtaa ha.
Nʼezie, aga m agbapụta ha,
ha ga-adịkwa ukwuu dịka ha dị na mbụ. 9A sịkwarị na m chụsara ha nʼetiti ndị dị iche iche,
ma ha ga-echeta m site nʼala niile ahụ dị anya.
Ha na ụmụ ha ga-adịkwa ndụ;
ha ga-alọtakwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.