Zekaraya 1:20
Zechariah 1:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri m ndị ọkpụ ụzụ anọ.
Zechariah 1:20 in English
Zechariah 1:20 · Berean Standard Bible
Then the LORD showed me four craftsmen.
Context
18Mgbe ahụ, eweliri m anya m abụọ elu hụ mpi anọ. 19Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu sị, “Gịnị ka ihe ndị a bụ?”
Ọ sịrị m, “Ndị a bụ mpi ndị ahụ chụsasịrị Juda, na Izrel, na Jerusalem.” 20Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri m ndị ọkpụ ụzụ anọ. 21Asịrị m, “Gịnị ka ndị na-abịa ime?”
Ọ zaghachiri m, “Ndị a bụ mpi anọ ndị ahụ chụsasịrị Juda, ime ka onye ọbụla ghara inwe ike iwelite isi ya. Ma ndị a abịala imenye ha ụjọ, na ịtụda mpi mba niile, bụ ndị ahụ buliri mpi ha imegide ala Juda, na ịchụsa ndị ya.”
1:17 Obodo m niile ga-esite nʼụba basaa ọzọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.