Zekaraya 1:10
Zechariah 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ onye ahụ guzo nʼetiti osisi mietul ndị ahụ sịrị, “Ndị a bụ ndị Onyenwe anyị zitere ka ha jegharịa nʼụwa niile.”
Zechariah 1:10 in English
Zechariah 1:10 · Berean Standard Bible
Then the man standing among the myrtle trees explained, “They are the ones the LORD has sent to patrol the earth.”
Context
8Nʼabalị ahụ, ahụrụ m nʼọhụ, otu nwoke na-agba ịnyịnya na-acha ọbara ọbara. O guzokwa nʼetiti osisi mietul, nke dị nʼebe miri emi nke mgbawa dị nʼala. Nʼazụ ya, ọtụtụ ịnyịnya na-acha ọbara ọbara, ndị na-acha ka ahịhịa kpọrọ nkụ, na ndị na-acha ọcha dịkwa. 9Ajụrụ m, “Nna m ukwu, gịnị bụ ihe ndị a?”
Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu sịrị m, “Aga m egosi gị ihe ha bụ.” 10Mgbe ahụ onye ahụ guzo nʼetiti osisi mietul ndị ahụ sịrị, “Ndị a bụ ndị Onyenwe anyị zitere ka ha jegharịa nʼụwa niile.” 11Ha sịrị mmụọ ozi nke Onyenwe anyị nke na-eguzo nʼetiti osisi mietul ahụ, “Anyị ejegharịala nʼụwa niile, ma lee anyị chọpụtara na ụwa niile nọ nʼudo, dịkwa jụụ.” 12Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị sịrị, “Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide hapụ imere Jerusalem na obodo niile nke Juda ebere, bụ obodo ị na-eweso iwe iri afọ asaa ndị a gara aga?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.