Taịtọs 3:4
Titus 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mgbe obiọma na ịhụnanya Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ihe,
Titus 3:4 in English
Titus 3:4 · Berean Standard Bible
But when the kindness of God our Savior and His love for mankind appeared,
Context
2Gwa ha ka ha ghara ikwulu onye ọbụla, ka ha gharakwa ịlụ ọgụ, kama, ka ha bụrụ enyi mmadụ niile, na-egosikwa ịdị nwayọọ ha nʼebe mmadụ niile nọ. 3Nʼihi na mbụ, anyị onwe anyị bụ ndị nzuzu, ndị na-enupu isi, na ndị na-enweghị uche. Anyị bụ ohu agụụ ihe ọjọọ, na ihe ụtọ dị iche iche. Anyị biri ndụ obi ọjọọ na ekworo, na ịkpọrịta onwe anyị asị. 4Ma mgbe obiọma na ịhụnanya Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ihe, 5ọ zọpụtara anyị, ma ọ bụghị nʼihi ezi ihe ndị anyị mere, kama ọ bụ site nʼebere ya. Ọ zọpụtara anyị site na nsacha nke ịmụ ọzọ na nnwogharị nke Mmụọ Nsọ, 6onye ọ wụsara anyị nʼuju site nʼOnye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.