Rut 3:12
Ruth 3:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ ezie na m bụ onye mgbapụta dị nso nke ezinaụlọ anyị, ma o nwere onye ọzọ dị ezi nso karịa m.
Ruth 3:12 in English
Ruth 3:12 · Berean Standard Bible
Yes, it is true that I am a kinsman-redeemer, but there is a redeemer nearer than I.*
Context
10Boaz zara sị ya, “Onyenwe anyị gọzie gị, nwa m nwanyị. Ịhụnanya i gosiri ugbu a akarịala nke i gosiri na mbụ, nʼihi na i gbasoghị ụmụ okorobịa, ma ha bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. 11Ma ugbu a, nwa m nwanyị, atụla ụjọ. Aga m emezuru gị dịka i si rịọọ, nʼihi na mmadụ niile maara na ị bụ onye nwere ezi agwa. 12Ọ bụ ezie na m bụ onye mgbapụta dị nso nke ezinaụlọ anyị, ma o nwere onye ọzọ dị ezi nso karịa m. 13Nọdụ nʼebe a nʼabalị a. Nʼụtụtụ, ọ bụrụ na onye ahụ ekwere imezu ọrụ ya dịka onye mgbapụta, ya rụzuo ya. Ọ bụrụ na o kwere, ọ dị mma, ọ bụrụkwanụ na o kweghị, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m emezu ya. Ugbu a, dinara ala ruo ụtụtụ.” 14Ya mere, Rut dinara nʼụkwụ ya ruo ụtụtụ. Ma chi abọzibeghị nke ọma mgbe o si nʼebe ahụ bilie nʼihi na Boaz sịrị ya, “Ekwela ka onye ọbụla mata na nwanyị bịara nʼebe ịzọcha ọka.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.