Native Bible

Ruth 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ hapụrụ ala Moab ebe ha bi kemgbe, malite ịgbaso ụzọ ha ga-esi laghachi nʼala Juda.

Ruth 1:7 in English

Ruth 1:7 · Berean Standard Bible

Accompanied by her two daughters-in-law, she left the place where she had been living and set out on the road leading back to the land of Judah.

Context

5Mahlọn na Kilịọn mechara nwụọ. Ya mere, Naomi ghọrọ onye gba aka di, na onye gba aka ụmụ. 6Mgbe Naomi nọ nʼala Moab nụ na Onyenwe anyị eletala ndị Izrel site nʼinye ha ihe oriri, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ kwadoro ịlaghachi azụ nʼala Izrel. 7Ya mere, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ hapụrụ ala Moab ebe ha bi kemgbe, malite ịgbaso ụzọ ha ga-esi laghachi nʼala Juda. 8Mgbe ahụ, Naomi gwara ndị nwunye ụmụ ya abụọ okwu sị ha, “Ngwa, onye ọbụla nʼime unu laghachi nʼụlọ nne ya.* Ka Onyenwe anyị gosi unu obiọma dịka unu si gosi mụ onwe m, na ndị unu nwụrụ anwụ. 9Ka Onyenwe anyị nyekwa unu di ọzọ ma meekwa ka unu chọta udo nʼezinaụlọ ọzọ.” Mgbe ahụ Naomi suturu ha ọnụ, ha niile kwara akwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.