Ndị Rom 7:19
Romans 7:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe m na-eme mgbe m chọrọ ime ezi ihe abụghị ezi ihe ahụ m chọrọ ime kama ọ bụ ajọọ ihe ahụ m na-achọghị ime ka m na-eme.
Romans 7:19 in English
Romans 7:19 · Berean Standard Bible
For I do not do the good I want to do. Instead, I keep on doing the evil I do not want to do.
Context
17Ma dịka ọ dị, ọ bụkwaghị mụ onwe m na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ mmehie bi nʼime m. 18O doro m anya na o nweghị ihe ọma ọbụla dị nʼime m, ya bụ nʼime anụ ahụ m. Nʼihi na ọ na-agụ m agụụ ime ezi ihe, ma ike ime ezi ihe adịghị nʼime m. 19Ihe m na-eme mgbe m chọrọ ime ezi ihe abụghị ezi ihe ahụ m chọrọ ime kama ọ bụ ajọọ ihe ahụ m na-achọghị ime ka m na-eme. 20Ọ bụrụ na m na-eme ihe ahụ m na-achọghị ime, ọ pụtara na ọ bụghị mụ onwe m na-eme ihe ndị ahụ. Kama ọ bụ mmehie bi nʼime m na-eme ha. 21Achọpụtara m iwu nke na-arụ ọrụ nʼime m. Mgbe m chọrọ ime ihe ọma, naanị ihe ọjọọ bụ ihe na-agara m aka ime.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.