Ndị Rom 16:5
Romans 16:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Biko kelekwaaranụ m ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ha. Keleerenụ m ezi enyi m Epinetus. Nwoke a bụ onye buru ụzọ nabata Kraịst nʼobi ya, nʼakụkụ Eshịa niile.
Romans 16:5 in English
Romans 16:5 · Berean Standard Bible
Greet also the church that meets at their house. Greet my beloved Epenetus, who was the first convert to Christ in the province of Asia.*
Context
3Keleerenụ m Prisila na Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ Kraịst Jisọs.* 4Ndị a atụghị egwu ọnwụ nʼihi ndụ m. Ọ bụghị naanị mụ onwe m na ekele ha, kama nzukọ Kraịst ndị dị na mba ọzọ niile na-ekelekwa ha. 5Biko kelekwaaranụ m ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ha.
Keleerenụ m ezi enyi m Epinetus. Nwoke a bụ onye buru ụzọ nabata Kraịst nʼobi ya, nʼakụkụ Eshịa niile. 6Keleerenụ m Meri, onye rụsịrị ọrụ ike nʼetiti unu. 7Ana m ekelekwa Andronaikọs na Juniya, ndị ikwu m, ndị e tinyekọtara mụ na ha nʼụlọ mkpọrọ. Ndị ozi niile na-asọpụrụ ha. Ha bukwa m ụzọ kwere na Kraịst.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.