Native Bible

Romans 15:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

abụ m onyeozi Kraịst Jisọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ.

Romans 15:16 in English

Romans 15:16 · Berean Standard Bible

to be a minister of Christ Jesus to the Gentiles in the priestly service of the gospel of God, so that the Gentiles might become an offering acceptable to God, sanctified by the Holy Spirit.

Context

14Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe. 15Ma otu ọ dị, edepụtala m ụfọdụ isi okwu nʼebe o doro anya nye unu, iji chetara unu ha ọzọ, nʼihi amara Chineke nyere m, 16abụ m onyeozi Kraịst Jisọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ. 17Nʼihi ya, ana m anya isi nʼime Kraịst Jisọs banyere ọrụ m na-arụrụ Chineke. 18Agaghị m anwa anwa kwuo okwu banyere ihe ọzọ karịakwa ihe ndị ahụ Kraịst rụpụtara site nʼaka m, bụ idubata ndị mba ọzọ, ime ka ha rube isi nye Chineke, site nʼokwu ọnụ m na ihe m rụrụ,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.