Ndị Rom 12:20
Romans 12:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma otu ọ dị, “ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, were nri zụọ ya, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ihe ọṅụṅụ ka ọ ṅụọ, mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya.”*
Romans 12:20 in English
Romans 12:20 · Berean Standard Bible
On the contrary, “If your enemy is hungry, feed him; if he is thirsty, give him a drink. For in so doing, you will heap burning coals on his head.”*
Context
18Dịka ike gị niile ha, mee ka gị na onye ọbụla biri nʼudo. 19Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,”* ka Onyenwe anyị kwuru. 20Ma otu ọ dị,
“ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, were nri zụọ ya,
ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ihe ọṅụṅụ ka ọ ṅụọ,
mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya.”* 21Unu ekwela ka ihe ọjọọ merie unu, kama werenụ ezi ihe merie ihe ọjọọ.
12:13 Ndị nke Onyenwe anyị
12:19 Dit 32:35
12:20 Ilu 25:21,22
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.