Ndị Rom 11:33
Romans 11:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu! Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile, ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta.
Romans 11:33 in English
Romans 11:33 · Berean Standard Bible
O, the depth of the riches of the wisdom and knowledge of God! How unsearchable are His judgments, and untraceable His ways!
Context
31Otu a ka ọ dịkwa, ha bụ ndị na-enupu isi ugbu a ka ha nwe ike soro unu keta oke site nʼebere Chineke meere unu. 32Nʼihi na Chineke enyefeela onye ọbụla nʼaka nnupu isi, ka o si otu a gosi mmadụ niile obi ebere ya. 33Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya siri dị ukwuu!
Apụghị ịchọpụta ikpe ya niile,
ụzọ ya niile bụkwa ihe apụghị ịchọpụta. 34“Onye maara uche Onyenwe anyị?
Ma ọ bụ onye bụ onye ahụ na-enye ya ndụmọdụ?”* 35“Onye burula ụzọ nye Chineke ihe,
nke ga-eme ka Chineke kwụghachi ya?”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.