Ndị Rom 1:14
Romans 1:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na abụ m onye ji ụgwọ nye ndị Griik na ndị mba ọzọ, nyekwa ndị maara ihe na ndị nzuzu.
Romans 1:14 in English
Romans 1:14 · Berean Standard Bible
I am obligated both to Greeks and non-Greeks,* both to the wise and the foolish.
Context
12Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume site nʼokwukwe anyị. 13Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata na atụọla m atụmatụ ịbịa leta unu ọtụtụ mgbe (ma tutu ruo ugbu a e gbochiri m ịbịa), ka m nwee ike nweta mkpụrụ nʼetiti unu, dịka m nwere nʼetiti ndị mba ọzọ. 14Nʼihi na abụ m onye ji ụgwọ nye ndị Griik na ndị mba ọzọ, nyekwa ndị maara ihe na ndị nzuzu. 15Ya mere m ji dị njikere ikwusa oziọma nyekwa unu bụ ndị bi na Rom. 16Nʼihi na ihere oziọma ahụ anaghị eme m, nʼihi na ọ bụ ike Chineke na-ewetara onye ọbụla kwere na ya nzọpụta, nye onye Juu na mbụ nakwa nye onye Griik.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.