Mkpughe 8:13
Revelation 8:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Elere m anya, hụ ma nụkwa otu ugo ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe na-eti mkpu nʼolu ike na-asị, “Ahụhụ! Ahụhụ! Ahụhụ dịrị mmadụ niile bi nʼụwa nʼihi ụda opi ike nke ndị mmụọ ozi atọ ndị a ga-afụ.” 8:12 Opi ike anọ mbụ dara metụtara ikpe Chineke nʼebe ihe e kere eke dị. Ihe a bụ ala, na osimiri, na iyi, na ihe ndị dị na mbara nʼelu, dị ka kpakpando, na anyanwụ na ọnwa.
Revelation 8:13 in English
Revelation 8:13 · Berean Standard Bible
And as I observed, I heard an eagle flying overhead, calling in a loud voice, “Woe! Woe! Woe to those who dwell on the earth, because of the trumpet blasts about to be sounded by the remaining three angels!”
Context
11Aha kpakpando ahụ bụ Ilu ilu. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmiri malitere ilu ilu, ọtụtụ mmadụ nwụrụ nʼihi mmiri a na-elu ilu. 12Mgbe mmụọ ozi nke anọ fụrụ opi ike ya, e mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere anyanwụ gbaa ọchịchịrị. Otu a kwa, otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere ọnwa gbara ọchịchịrị. Ya na otu akụkụ nʼime atọ e kere kpakpando niile. Nke a mere ka anyanwụ hapụ inyekwa ìhè ya nʼuju dịka o si eme na mbụ. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere ehihie ghọkwara oke ọchịchịrị, ọ dịkwa otu a nʼoge anyasị.* 13Elere m anya, hụ ma nụkwa otu ugo ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe na-eti mkpu nʼolu ike na-asị, “Ahụhụ! Ahụhụ! Ahụhụ dịrị mmadụ niile bi nʼụwa nʼihi ụda opi ike nke ndị mmụọ ozi atọ ndị a ga-afụ.”
8:12 Opi ike anọ mbụ dara metụtara ikpe Chineke nʼebe ihe e kere eke dị. Ihe a bụ ala, na osimiri, na iyi, na ihe ndị dị na mbara nʼelu, dị ka kpakpando, na anyanwụ na ọnwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.