Mkpughe 8:12
Revelation 8:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe mmụọ ozi nke anọ fụrụ opi ike ya, e mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere anyanwụ gbaa ọchịchịrị. Otu a kwa, otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere ọnwa gbara ọchịchịrị. Ya na otu akụkụ nʼime atọ e kere kpakpando niile. Nke a mere ka anyanwụ hapụ inyekwa ìhè ya nʼuju dịka o si eme na mbụ. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere ehihie ghọkwara oke ọchịchịrị, ọ dịkwa otu a nʼoge anyasị.*
Revelation 8:12 in English
Revelation 8:12 · Berean Standard Bible
Then the fourth angel sounded his trumpet, and a third of the sun and moon and stars were struck. A third of the stars were darkened, a third of the day was without light, and a third of the night as well.
Context
10Mgbe mmụọ ozi nke atọ fụrụ opi ike ya, otu kpakpando dịkarịsịrị ukwuu nke na-enwu dị ka ọwaọkụ sitere na mbara eluigwe danye nʼime otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere iyi niile na isi iyi niile. 11Aha kpakpando ahụ bụ Ilu ilu. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmiri malitere ilu ilu, ọtụtụ mmadụ nwụrụ nʼihi mmiri a na-elu ilu. 12Mgbe mmụọ ozi nke anọ fụrụ opi ike ya, e mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere anyanwụ gbaa ọchịchịrị. Otu a kwa, otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere ọnwa gbara ọchịchịrị. Ya na otu akụkụ nʼime atọ e kere kpakpando niile. Nke a mere ka anyanwụ hapụ inyekwa ìhè ya nʼuju dịka o si eme na mbụ. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere ehihie ghọkwara oke ọchịchịrị, ọ dịkwa otu a nʼoge anyasị.* 13Elere m anya, hụ ma nụkwa otu ugo ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe na-eti mkpu nʼolu ike na-asị, “Ahụhụ! Ahụhụ! Ahụhụ dịrị mmadụ niile bi nʼụwa nʼihi ụda opi ike nke ndị mmụọ ozi atọ ndị a ga-afụ.”
8:12 Opi ike anọ mbụ dara metụtara ikpe Chineke nʼebe ihe e kere eke dị. Ihe a bụ ala, na osimiri, na iyi, na ihe ndị dị na mbara nʼelu, dị ka kpakpando, na anyanwụ na ọnwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.