Mkpughe 7:5
Revelation 7:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a kara akara site nʼebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ (12,000). Ndị si nʼebo Gad dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Revelation 7:5 in English
Revelation 7:5 · Berean Standard Bible
From the tribe of Judah 12,000 were sealed, from the tribe of Reuben 12,000, from the tribe of Gad 12,000,
Context
3na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.” 4Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel. 5Ndị a kara akara site nʼebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị si nʼebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị si nʼebo Gad dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000). 6E sitere nʼebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị sitekwara nʼebo Naftalị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
E sitere nʼebo Manase* họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000). 7Ndị si nʼebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị sitere nʼebo Livayị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị si nʼebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.