Mkpughe 3:5
Revelation 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla na-emeri emeri, ka a ga-eyikwasị uwe mwụda ọcha dịka ha. Agaghị m ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, kama aga m ekwupụtakwa aha ahụ nʼihu Nna m na nʼihu ndị mmụọ ozi niile.
Revelation 3:5 in English
Revelation 3:5 · Berean Standard Bible
Like them, he who overcomes will be dressed in white. And I will never blot out * his name from the Book of Life, but I will confess his name before My Father and His angels.
Context
3Ya mere, cheta ihe ndị ahụ ị natara na nke ị nụrụ; rube isi nye ya, chegharịakwa. Ma ọ bụrụ na i tetaghị, aga m abịakwute gị dị ka onye ohi, ị gaghị amatakwa oge m ji bịakwute gị. 4Otu ọ dị, i nwere ụfọdụ mmadụ na Sardis ndị na-emerụbeghị uwe ha. Ha ga-eyiri uwe ọcha ma soro m jee ije nʼihi na ha bụ ndị kwesiri ekwesi. 5Onye ọbụla na-emeri emeri, ka a ga-eyikwasị uwe mwụda ọcha dịka ha. Agaghị m ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, kama aga m ekwupụtakwa aha ahụ nʼihu Nna m na nʼihu ndị mmụọ ozi niile. 6Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ nsọ na-agwa nzukọ niile. 7“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Filadelfia, sị ya:
Ndị a bụ okwu onye dị nsọ na onye eziokwu, onye ahụ ji ọtụghe igodo Devid, nke o ji emeghepụ ihe onye ọbụla na-apụghị imechi, na nke o ji emechi ihe onye ọbụla na-apụghị imeghe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.