Native Bible

Revelation 22:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

nʼetiti okporoụzọ ahụ dị nʼobodo ahụ. Nʼakụkụ aka nri na aka ekpe iyi ahụ, a ga-ahụ osisi ahụ na-enye ndụ. Osisi ndị a na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ dị iche iche. Ha na-amịpụta mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa ọbụla. Akwụkwọ osisi ahụ wapụtara bụ ọgwụ e ji agwọ mba niile.

Revelation 22:2 in English

Revelation 22:2 · Berean Standard Bible

down the middle of the main street of the city. On either side of the river stood a tree of life, bearing twelve kinds of fruit and yielding a fresh crop for each month. And the leaves of the tree are for the healing of the nations.

Context

1Mmụọ ozi ahụ gosiri m iyi ahụ e si ekute mmiri nke na-enye ndụ nke na-enwu dịka kristal. O sikwa nʼokpuru ocheeze Chineke na Nwa atụrụ ahụ na-asọpụta, 2nʼetiti okporoụzọ ahụ dị nʼobodo ahụ. Nʼakụkụ aka nri na aka ekpe iyi ahụ, a ga-ahụ osisi ahụ na-enye ndụ. Osisi ndị a na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ dị iche iche. Ha na-amịpụta mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa ọbụla. Akwụkwọ osisi ahụ wapụtara bụ ọgwụ e ji agwọ mba niile. 3A gaghị ahụ ihe ọbụla a bụrụ ọnụ nʼime obodo ahụ. Ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ ga-adị nʼobodo ahụ. Ndị ohu ya ga-efekwa ya ofufe. 4Ha ga-ahụkwa ihu ya, a ga-edekwa aha ya nʼegedege ihu ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.