Mkpughe 21:14
Revelation 21:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbidi ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. Nʼelu nkume ndị a nʼotu nʼotu ka e dere aha ndị ozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.
Revelation 21:14 in English
Revelation 21:14 · Berean Standard Bible
The wall of the city had twelve foundations bearing the names of the twelve apostles of the Lamb.
Context
12Mgbidi ya niile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel nʼọnụ ụzọ ama ndị a nʼotu nʼotu. 13Ọnụ ụzọ ama atọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, atọ dị nʼakụkụ ugwu, atọ dị nʼakụkụ ndịda, ebe atọ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. 14Mgbidi ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. Nʼelu nkume ndị a nʼotu nʼotu ka e dere aha ndị ozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ. 15Onye ahụ na-agwa m okwu ji osisi e ji atụ ihe, nke e ji ọlaedo mee, nʼaka ya. O ji ya tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ama ya, na mgbidi ya. 16Nʼobodo ahụ, enweghị otu akụkụ nʼime akụkụ anọ nke mgbidi ya karịrị ibe ya. Ogologo ya na obodobo ya ha otu. O ji ihe ọtụtụ tụọ ya, ogologo ya na obodobo nakwa ịdị elu ya ha, ọtụtụ ya dị puku kilomita abụọ na narị kilomita abụọ.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.