Native Bible

Revelation 21:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.* Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa.

Revelation 21:1 in English

Revelation 21:1 · Berean Standard Bible

Then I saw a new heaven and a new earth,* for the first heaven and earth had passed away, and the sea was no more.

Context

1Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.* Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa. 2Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya. 3Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.