Native Bible

Revelation 2:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Tiatira, sị ya: Ndị a bụ okwu sitere nʼaka Ọkpara Chineke, onye anya ya na-enwuba nʼebe niile dị ka ire ọkụ. Ụkwụ ya kwa na-egbu maramara dị ka bronz a nụchara nke ọma.

Revelation 2:18 in English

Revelation 2:18 · Berean Standard Bible

To the angel of the church in Thyatira write: These are the words of the Son of God, whose eyes are like a blazing fire and whose feet are like polished bronze.

Context

16Ya mere, chegharịa! Ma ọ bụghị otu a, aga m abịakwute gị ọsịịsọ jiri mma agha dị m nʼọnụ buso ha agha. 17Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Ọ bụ naanị onye na-emeri emeri ka m ga-enye ụfọdụ nʼime achịcha mánà ahụ e zoro ezo. Aga m enyekwa onye ahụ ezi nkume ọcha ahụ, nke edekwasịrị aha ọhụrụ nʼelu ya, nke onye ọbụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ natara ya. 18“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Tiatira, sị ya: Ndị a bụ okwu sitere nʼaka Ọkpara Chineke, onye anya ya na-enwuba nʼebe niile dị ka ire ọkụ. Ụkwụ ya kwa na-egbu maramara dị ka bronz a nụchara nke ọma. 19Amaara m ọrụ gị niile, na ịhụnanya gị, na okwukwe gị. Amakwaara m ije ozi gị na ntachiobi gị, na-ahụkwa na ị na-arụ ọrụ ugbu a karịa ka i mere na mbụ. 20Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezebel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyị* nye ya ohere ka o were nkuzi asị na-eduhie ndị ohu m ụzọ, ka ha kwaa iko, riekwa ihe e ji chụọrọ arụsị aja.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.