Mkpughe 18:2
Revelation 18:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O ji olu dị ike tie mkpu, “ ‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’* Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha, nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ.
Revelation 18:2 in English
Revelation 18:2 · Berean Standard Bible
And he cried out in a mighty voice: “Fallen, fallen is Babylon the great!* She has become a lair for demons and a haunt for every unclean spirit, every unclean bird, and every detestable beast.*
Context
1Mgbe ihe ndị a niile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼeluigwe na-arịdata. E nyere ya ikike dị ukwuu, ebube ya mekwara ka ihe jupụta nʼụwa. 2O ji olu dị ike tie mkpu,
“ ‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’*
Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọ
nʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha,
nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụ
nʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ. 3Nʼihi na mba niile aṅụọla
site na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.
Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko,
ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.” 4Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị,
“ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’*
ka unu ghara iketa oke na mmehie ya,
ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.