Mkpughe 11:19
Revelation 11:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ kwa, e meghere ụlọnsọ Chineke nke dị nʼeluigwe. A hụkwara igbe ọgbụgba ndụ nʼime ya. Nʼotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji na akụmmiri igwe mere mkpọtụ nke ukwuu. 11:4 Abụ 52:8; Zek 4:3,11,14 11:7 Anụ ọhịa a bụ onye na-emegide Kraịst.
Revelation 11:19 in English
Revelation 11:19 · Berean Standard Bible
Then the temple of God in heaven was opened, and the ark of His covenant appeared in His temple. And there were flashes of lightning, and rumblings, and peals of thunder, and an earthquake, and a great hailstorm.
Context
17na-asị,
“Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile.
Onye na-adị, na onye dịkwaarị,
nʼihi na i werela oke ike gị niile nʼaka gị
malitekwa ịchị ọchịchị. 18Mba niile were oke iwe megide gị,
ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ.
Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe
na ịkwụghachi ndị ohu gị bụ ndị amụma ụgwọ ọrụ ha,
na ndị nsọ na ndị gị niile, bụ ndị na-atụ egwu aha gị,
bụ ndị dị nta na ndị dị ukwuu.
Oge eruokwala mgbe ịla nʼiyi ndị na-emebi ụwa ga-adị.” 19Mgbe ahụ kwa, e meghere ụlọnsọ Chineke nke dị nʼeluigwe. A hụkwara igbe ọgbụgba ndụ nʼime ya. Nʼotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji na akụmmiri igwe mere mkpọtụ nke ukwuu.
11:4 Abụ 52:8; Zek 4:3,11,14
11:7 Anụ ọhịa a bụ onye na-emegide Kraịst.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.