Mkpughe 1:6
Revelation 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
Revelation 1:6 in English
Revelation 1:6 · Berean Standard Bible
who has made us to be a kingdom, priests to His God and Father—to Him be the glory and power forever and ever! Amen.
Context
4Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a,
Na-edere ya nzukọ asaa dị na mpaghara Eshịa:
Ka amara na udo nke sitere na Onye ahụ na-adị, Onye ahụ dịkwaarị, na Onye ahụ na-aga ịbịa dịrị unu, sitekwa nʼebe Mmụọ asaa* ahụ na-eguzo nʼihu ocheeze ya, 5sitekwa nʼaka Jisọs Kraịst, onye bụ onyeama kwesiri ntụkwasị obi, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilie, nakwa onye na-achị ndị eze niile nke ụwa.
Nye onye ahụ hụrụ anyị nʼanya ma meekwa ka anyị site nʼọbara ya nwere onwe anyị pụọ na mmehie. 6O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 7“Lee, ọ na-abịa ya na igwe ojii.*
Anya niile ga-ahụkwa ya,
ọ bụladị ndị ahụ niile mapuru ya ahụ, ha ga-ahụ ya.”*
Mmadụ niile nọ nʼụwa “ga-erukwa ụjụ nʼihi ya.”
Otu a ka ọ ga-adị! Amen. 8Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, “Abụ m Alfa na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.