Mkpughe 1:5
Revelation 1:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
sitekwa nʼaka Jisọs Kraịst, onye bụ onyeama kwesiri ntụkwasị obi, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilie, nakwa onye na-achị ndị eze niile nke ụwa. Nye onye ahụ hụrụ anyị nʼanya ma meekwa ka anyị site nʼọbara ya nwere onwe anyị pụọ na mmehie.
Revelation 1:5 in English
Revelation 1:5 · Berean Standard Bible
and from Jesus Christ, the faithful witness, the firstborn from the dead, and the ruler of the kings of the earth. To Him who loves us and has released us from our sins by His blood,
Context
3Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-agụpụta okwu ndị a dị nʼamụma a. Ngọzị na-adịkwara ndị na-anụ ya, ma nabata ihe e dere nʼime ya nʼobi ha. Nʼihi na oge mmezu ha dị nso. 4Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a,
Na-edere ya nzukọ asaa dị na mpaghara Eshịa:
Ka amara na udo nke sitere na Onye ahụ na-adị, Onye ahụ dịkwaarị, na Onye ahụ na-aga ịbịa dịrị unu, sitekwa nʼebe Mmụọ asaa* ahụ na-eguzo nʼihu ocheeze ya, 5sitekwa nʼaka Jisọs Kraịst, onye bụ onyeama kwesiri ntụkwasị obi, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilie, nakwa onye na-achị ndị eze niile nke ụwa.
Nye onye ahụ hụrụ anyị nʼanya ma meekwa ka anyị site nʼọbara ya nwere onwe anyị pụọ na mmehie. 6O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 7“Lee, ọ na-abịa ya na igwe ojii.*
Anya niile ga-ahụkwa ya,
ọ bụladị ndị ahụ niile mapuru ya ahụ, ha ga-ahụ ya.”*
Mmadụ niile nọ nʼụwa “ga-erukwa ụjụ nʼihi ya.”
Otu a ka ọ ga-adị! Amen.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.