Abụ Ọma 85:9
Psalms 85:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, nzọpụta ya dị nso* ndị na-atụ egwu ya, ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị.
Psalms 85:9 in English
Psalms 85:9 · Berean Standard Bible
Surely His salvation is near to those who fear Him, that His glory may dwell in our land.
Context
7O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide,
nyekwa anyị nzọpụta gị. 8Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu;
ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo,
ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu. 9Nʼezie, nzọpụta ya dị nso* ndị na-atụ egwu ya,
ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị. 10Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala;
ezi omume na udo esutula ọnụ. 11Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta,
ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.